Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwhf isiokwu 7
  • Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe
  • Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe i kwesịrị ịma
  • Ihe i nwere ike ime
  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
    Teta!—2019
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
ijwhf isiokwu 7
Ebe otu nne na-akasi nwa ya nwaanyị dara n’ule obi

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe

Ụmụ gị nwere ike imejọ ihe ụfọdụ ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu. Nke a nwere ike ime ka obi jọwa ha njọ. Olee otú ị ga-esi enyere ha aka inweta onwe ha?

  • Ihe i kwesịrị ịma

  • Ihe i nwere ike ime

Ihe i kwesịrị ịma

Anyị niile na-emejọ ihe mgbe ụfọdụ. Baịbụl sịrị na “anyị niile na-asụ ngọngọ.” (Jems 3:2) Ụmụaka na-emejọkwa ihe. Ma, o nwere ihe ha nwere ike ịmụta n’ihe ha mejọrọ. Ọ ga-akụziri ha otú ha ga-esi na-edi ihe ndị ha mejọrọ. Ụmụaka anaghị esi n’afọ ama otú e si edi ihe, ma ha nwere ike ịmụta ya. Otu nne aha ya bụ Laura kwuru sị: “Mụ na di m chọpụtara na ọ ka mma ka ụmụntakiri mụta ịna-edi nsogbu ndị na-abịara ha kama imewe ka à ga-asị na o nweghi ihe merenụ. Ọ ga-eme ka ha mụta otú ha ga-esi edi nsogbu ha mgbe ihe na-agaghị otú a tụru anya ya.”

Ọtụtụ ụmụaka amaghị otú e si emezi ihe ha mebiri. Ụfọdụ ụmụaka anaghị ama otú ha ga-esi emezi ihe ha mebiri n’ihi na ndị mụrụ ha na-agbachitere ha mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwatakịrị emeghị nke ọma n’ule, ụfọdụ ndị nne na nna na-ebo ya onye nkụzi ha. Ọ bụrụ na nwatakịrị na enyi ya esee okwu, ndị mụrụ ya na-asị na ọ bụ enyi nwa ha chọrọ ya okwu.

Oleekwanụ otú nwatakịrị ga-esi ekweta na o mejọrọ ihe ma gbalịa imezi ya ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ya anaghị ekwe ka ọ taa ahụhụ ihe o metara?

Ebe a na-enyere otu nwantakịrị nwaanyị dara n’ule aka ịgụsi akwụkwọ ike ka o nwee ike ime nke ọma n’ule ọzọ

Ihe i nwere ike ime

  • Mee ka ụmụ gị mata na ihe ọ bụla ha mere nwere ihe ga-esi na ya apụta.

    Baịbụl sịrị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.”​—Ndị Galeshia 6:7.

    Ihe ọ bụla anyị na-eme nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọ anyị ahịa. Anyị mebie ihe, ọ ga efu anyị ihe iji mezie ya. Anyị mejọọ ihe, ọ ga-akpatara anyị nsogbu. E kwesịrị ịkụziri ụmụaka na ihe ọ bụla anyị mere, nwere ihe ọ na-akpata. E kwesịkwara inyere ha aka ikweta na ha mejọrọ ihe. N’ihi ya, adịkwala na-ata onye ọzọ ụta ma ọ bụ na-agbachitere ụmụ gị maka ihe ha mejọrọ. Kama, kwee ka ha tatụ ahụhụ ihe ha mejọrọ, dabere n’afọ ndụ ha. Ma, e kwesịrị ime ka nwatakịrị mata na ọ bụ ihe o mejọrọ mere e ji taa ya ahụhụ.

  • Kụziere ụmụ gị otú ha ga-esi na-emezi ihe ha mejọrọ.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.”​—Ilu 24:16.

    Anyị mejọọ ihe, o nwere ike ịgbawa anyị obi, ma ọ pụtaghị na nke anyị na-eme agwụla. Ụmụ gị mejọọ ihe, nyere ha aka ka ha na-eche otú ha ga-esi ghara ime ihe ahụ ọzọ, kama ịna-eche na ihe ahụ merenụ e kwesịghị ime. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị adaa n’ule, nyere ya aka ka ọ gụsie akwụkwọ ike ma kpebisi ike na ya ga-eme nke ọma n’ule ọzọ. (Ilu 20:4) Ọ bụrụ na nwa gị nwaanyị na enyi ya nwere nghọtahie, nyere ya aka ka ọ mata otú ọ ga-esi agakwuru ya ka ha kpezie n’agbanyeghị onye mejọrọ ibe ya.​—Ndị Rom 12:18; 2 Timoti 2:24.

  • Kụziere ụmụ gị ka ha dịrị umeala n’obi.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.”​—Ndị Rom 12:3.

    Ịna-agwa nwa gị na ọ ka ndị ọzọ mma ekwesịghị ekwesị, ọ gaghịkwa enyere ya aka. A sị ka e kwukwe, ọ bụghị mgbe niile ka nwatakịrị ụbụrụ na-aghọ nkọ ga-eme nke ọma n’ule. Ọ bụghịkwa mgbe niile ka nwatakịrị na-eme nke ọma n’egwuregwu ga-emeri. Ụmụntakịrị ndị dị umeala n’obi na-aka edi ihe ha mejọrọ karịa ụmụaka ndị ọzọ. Ha na-akakwa ha edi ihe mgbe ihe na-agaghị otú ha tụru anya ya.

    Baịbụl kwuru na nsogbu bịaara anyị nwere ike ime ka anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị na-enwekwu ndidi. (Jems 1:​2-4) N’agbanyeghị na ọ na-ewute mmadụ ma o mejọọ ihe ma ọ bụkwanụ ma ihe agaghị otú ọ tụrụ anya ya, ma i nwere ike inyere ụmụ gị aka ka ha ghara ikwe ka o mee ka ha daa mbà.

    Ịkụziri ụmụaka idi ihe mere ha na-ewe oge otú ahụ ịkụziri mmadụ aka ọrụ na-ewe oge. Ọ chọkwara ịgbasi mbọ ike. Ma ọ ga-abara ha uru mgbe ha na-eto eto. Akwụkwọ bụ́ Letting Go With Love and Confidence kwuru, sị: “O yiri ka ndị na-eto eto ma otú e si edi nsogbu bịaara ha agachaghị agbara ọsọ mee ihe ọjọọ ma ha nwee nsogbu. Ihe ha na-atụghị anya ya mee ha, ha ga-aka edi ya.” O doro anya na nwatakịrị mụta otú e si edi nsogbu mgbe ọ na-eto eto, ọ ga-abara ya uru ma o too.

Aro: Jiri ihe ị na-eme kụziere ụmụ gị ihe. Cheta na ihe ị na-eme mgbe ihe na-agaghị otú ị tụrụ anya ya ga-akụziri ụmụ gị ihe ha ga-eme ma ihe ha na-atụghị anya ya mee.

Ihe ị ga-eburu n’uche: Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe

  1. Mee ka ụmụ gị mata na ihe ọ bụla ha mere nwere ihe ga-esi na ya apụta.

  2. Kụziere ụmụ gị otú ha ga-esi na-emezi ihe ha mejọrọ.

  3. Kụziere ụmụ gị ka ha dịrị umeala n’obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya