IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE
Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu
Ekwentị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya nwere ike ịbara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị uru ma ọ bụ butere unu nsogbu. Olee nke ọ na-emere unu?
Ihe i kwesịrị ịma
Iji ekwentị na ihe ndị yiri ya eme ezigbo ihe nwere ike ịbara di na nwunye uru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ di na nwunye na-eji ekwentị ezirịta ozi n’ụbọchị mgbe ha abụọ na-anọghị nso.
Otu nwoke aha ya bụ Jonathan sịrị: ‘Mgbe ọ bụla nwunye m ziteere m ozi n’ekwentị gwa m na ọ hụrụ m n’anya ma ọ bụ na ya na-eche banyere m, ọ na-eme ka m hụkwuo ya n’anya.’
Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-apịkarị ekwentị ya, o nwere ike ime ka ha nwewe nsogbu. Dị ka ihe atụ, o nwere ndị anya ha na-atọkarị n’ekwentị nke na ha anaghị enwe ohere gee di ha ma ọ bụ nwunye ha ntị ma ọ bụdi nwee mgbe ha na ya ji ekwurịta okwu.
Otu nwaanyị aha ya bụ Julissa sịrị: “Ama m na e nweela oge ndị di m gaara achọ ka mụ na ya kparịta ụka ma ya abụrụ na m na-apị ekwentị m.”
Ụfọdụ ndị sị na ọ bụrụ na ha na-apịgodị ekwentị ha, ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha nwekwara ike ịna-akparịta ụka nke ọma n’otu oge ahụ. Ma Sherry Turkle, onye bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya, kwuru na nke ahụ bụ “ihe na-abụghị eziokwu gbasara mmadụ ime ọtụtụ ihe n’otu oge.” Ime ọtụtụ ihe otu oge abụghị ihe ọma, n’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eche na ọ dị mma. Ọ sịrị na nke bụ́ eziokwu bụ na “ọ bụrụ na anyị achịkọta ọtụtụ ihe anyị chọrọ ime n’otu oge, anyị agaghị enwe ike imetacha ha nke ọma.”a
Otu nwaanyị aha ya bụ Sarah sịrị: “Ọ na-atọ m ụtọ ma mụ na di m kparịtawa ụka, ma obi anaghị adị m mma mgbe ọ bụla ọ na-apị ekwentị mgbe mụ na ya na-akparịta ụka. Ihe m na-aghọta n’oge ahụ bụ na obi ga-aka adị ya ụtọ ma m hapụ ya ka ọ pịwa ekwentị ya.”
Ihe ị ga-eburu n’obi: Otú i si apị ekwentị gị nwere ike ịkpatara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nsogbu ma ọ bụ baara unu uru.
Ihe i nwere ike ime
Mara ihe ndị ka mkpa. Baịbụl sịrị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Jụọ onwe gị, sị, ‘Oge mụ na di m ma ọ bụ nwunye m na-eji apị ekwentị anyị, ọ̀ na-eme ka anyị ghara inwe ohere kparịta ụka ka di na nwunye?’
Otu nwoke aha ya bụ Matthew, sịrị: “Ọ na-ewute m ma m hụ nwoke na nwaanyị bịara iri nri n’ebe a na-eri nri, onye nke ọ bụla anọrọ na-apị ekwentị ya. Ọ dịghị mma ka ekwentị anyị dị anyị mkpa nke na anyị ga-echefu ihe kacha mkpa, ya bụ, anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ịbụ ezigbo enyi.”
Kpebienụ mgbe onye ọ bụla na-agaghị emetụ ekwentị ya aka. Baịbụl sịrị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Jụọ onwe gị, sị, ‘È nwere m ike iwepụta oge m ga-eji na-agụ ma na-azaghachi ozi ndị na-abụghị ihe gbata gbata ndị e ziteere m n’ekwentị kama ịna-achọ ịzaghachi ozi ọ bụla batara ozugbo?’
Jonathan sịrị: “Achọpụtala m na ọ na-akara m mma itinye ekwentị m na “gba nkịtị,” e mechazie mụ agụọ ma zaghachi ozi ndị e ziteere m n’oge kwesịrị ekwesị. Ọ na-ara ahụ́ inwe mgbe ozi bataranụ bụ ozi gbata gbata, nke chọrọ ka e lebara ya anya ozugbo.”
O kwe omume, ebula ọrụ gị lọta n’ụlọ. Baịbụl sịrị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.” (Ekliziastis 3:1) Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Ana m ekwe ka ọrụ m na-ewekọrọ oge mụ na ndị ezinụlọ m ji anọrị n’ihi na m na-eji ekwentị m arụ ihe ndị m kwesịrị ịrụ n’ụlọ ọrụ ma m lọta n’ụlọ? Ọ bụrụ na m na-eme ya, olee otú ọ na-adị di m ma ọ bụ nwunye m? Gịnị ka di m ma ọ bụ nwunye m ga-ekwu ma a jụọ ya ajụjụ a?’
Matthew sịrị: “Ekwentị na ihe ndị yiri ya emeela ka ọ dịrị anyị mfe ịnọ ebe ọ bụla rụọ ọrụ nakwa n’oge ọ bụla anyị chọrọ ịrụ ya. Ana m agbalịsi ike ka m ghara ịna-ele ekwentị m anya mgbe niile, ma ọ bụ na-arụ ọrụ ndị m kwesịrị ịrụ n’ụlọ ọrụ mgbe ọ bụla mụ na nwunye m nọ.”
Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe unu ga-eme maka ekwentị unu. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuo gbasara otú unu si apị ekwentị unu. Unu kwuokwa ma è nwere mgbanwe ndị unu kwesịrị ime. Unu nwere ike iji ajụjụ ndị dị n’ebe ahụ e kwuru ihe ga-enyere unu aka ịma ihe unu ga-akparịta, nke dị n’isiokwu a, kwurịta ya.
Otu nwaanyị aha ya bụ Danielle sịrị: “Mụ na di m na-agwa ibe anyị eziokwu. Anyị anaghị ezoro ibe anyị ọnụ ma anyị chọpụtahaala na e nwere onye bidoro ịpị ekwentị ya karịa ka o kwesịrị. Anyị ma na ịpịkarị ekwentị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. N’ihi ya, anyị anaghị eji ihe onye nke ọ bụla n’ime anyị kwuru egwu egwu.”
Ihe ị ga-eburu n’obi: Hụ na ọ bụ gị na-atụrụ ekwentị gị ụka, ọ bụghị ya ga na-atụrụ gị ụka.
a Ebe e si nweta ya bụ n’akwụkwọ a kpọrọ Reclaiming Conversation—The Power of Talk in a Digital Age.