Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 86
  • Ime Anwansi Ọ̀ Dị Njọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Anwansi Ọ̀ Dị Njọ?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere o ji amasị ndị mmadụ?
  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya?
  • Ihe i nwere ike ime
  • Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị Iji Guzogide Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ime Mgbaasị?
    Teta!—2017
  • Ihe Mere I Kwesịrị Iji Zere Mgbaasị
    Teta!—2008
  • N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Ndị Ji Nwee Mmasị ná Mgbaasị?
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 86
Ebe ụmụ agbọghọ abụọ na-ele akwụkwọ ochie kwuru gbasara ime anwansi

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ime Anwansi Ọ̀ Dị Njọ?

Gịnị ka i chere?

  • È nwere ihe dị njọ n’ịgụ kpakpando, iji bọọdụ e ji agba afa na-agba afa, ma ọ bụ ime anwansi?

  • Ime anwansi ọ̀ bụ naanị akụkọ gbasara ihe ọma na ihe ọjọọ ka ọ̀ bụ ihe dị njọ mmadụ na-ekwesịghị itinye aka na ya?

Isiokwu a ga-atụle ihe mere ime mgbaasị ji amasị ndị mmadụ, nakwa ihe mere anyị ji kwesị ịkpachara anya.

  • Gịnị mere o ji amasị ndị mmadụ?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anyị?

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị mere o ji amasị ndị mmadụ?

Ndị na-eme egwuregwu na-enweta nnukwu ego n’imepụta fim, egwuregwu tiivi, egwuregwu kọmputa na akwụkwọ ndị na-ekwu banyere anwansi. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji enwe mmasị n’ịgụ kpakpando, ịma gbasara ndị mmụọ ọjọọ, ndị nwụrụ anwụ a sị na ha pụtara na-emenye ndị mmadụ ụjọ. Gịnị mere o ji amasị ndị na-eto eto? Ụfọdụ ihe kpatara ya bụ:

  • Ịchọ ịmata ihe: Ha na-achọ ịma ma ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ hà dị adị n’eziokwu

  • Ịchọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu: Ha na-achọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu

  • Mkpakọrita: Ha na-agbalị iso ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ kwurịta okwu

O nwere ike ihe ndị a mere anwansi ji amasị ha adịghị njọ n’onwe ha. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị njọ mmadụ iche banyere ihe ọdịnihu ya ga-abụ ma ọ bụ agụụ ịhụ onye ya nwụrụ anwụ anya ọzọ ịgụ ya. Ma, e nwere nsogbu mmadụ kwesịrị ịma gbasara ya.

Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya?

Baịbụl dọsiri anyị aka ná ntị ike gbasara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ anyị na mgbaasị. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị:

“A gaghị ahụ n’etiti unu . . . onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.”​—Diuterọnọmi 18:​10-12.

Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ime mgbaasị adịghị mma?

  • Ọ bụrụ na anyị na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọrịta ihe, anyị na-akwado ha. Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị mmụọ ozị nupụụrụ Chineke isi ma mee onwe ha ndị iro Chineke. (Jenesis 6:2; Jud 6) A kpọrọ ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi, ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-ejikwa ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, ndị dibịa afa, ndị na-agba afa na ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu eduhie ndị mmadụ. Ime ihe ndị ahụ ga-eme ka anyị na ndị iro Chineke bụrụ enyi.

  • Ime mgbaasị na-eme ka ndị mmadụ kwere na nkwenkwe ụgha bụ́ na ụfọdụ mmadụ nwere ike ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ọ bụ naanị Chineke nwere ike ikwuli, sị: ‘M na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.’​—Aịzaya 46:10; Jems 4:​13, 14.

  • Ime mgbaasị na-eme ka ndị mmadụ kwere na nkwenkwe ụgha bụ́ na ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ nwere ike ikwurịta okwu. Ma, Baịbụl kwuru sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị . . . Ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol.”​—Ekliziastis 9:​5, 10.

Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova ji agbara ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị ọsọ. Ha anaghịkwa eme egwuregwu ma ọ bụ na-ele fim ndị kwuru gbasara ndị amusu na ndị nwụrụ anwụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria kwuru, sị: “Ọ bụrụ na fim m ji atụrụ ndụ nwere ihe ndị jikọrọ ya na mgbaasị, ekwesịghị m ile ya.”a

Ebe otu nwa okorobịa na-aza onye kpọrọ ya n’ekwentị. O chere na onye ahụ bụ ezigbo mmadụ, ma ọ maghị na ọ bụ onye omekome.

Otú ahụ onye omekome nwere ike ịnwa imegharị gị anya ka i chee na ọ bụ onye ọzọ, ka ndị mmụọ ọjọọ nwere ike isi mee ka hà bụ ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.

Ihe i nwere ike ime

  • Kpebisie ike na ị ‘ga-enwe akọ na uche dị ọcha’ n’ihu Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ izere ihe ọ bụla ma ọ bụ ihe e ji atụrụ ndụ ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na anwansi.​—Ọrụ Ndịozi 24:16.

  • Bibie ihe ọ bụla i nwere nke nwere ihe jikọrọ ya na anwansi. Gụọ Ọrụ Ndịozi 19:​19, 20 ma chọpụta ihe Ndị Kraịst dịrị ndụ n’oge ndịozi mere, nke anyị kwesịkwara ime.

Cheta: Ọ bụrụ na i zere ime anwansi na ihe e ji atụrụndụ nwere ihe jikọrọ ya na anwansi, ọ na-egosi na ị na-akwado Jehova. Nke a na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.​—Ilu 27:11.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Brandon

“Ọtụtụ ihe ụmụaka ji egwu egwu na-ekwu gbasara mgbaasị, majik, ịbụ mmadụ ọnụ, ịkọ ọgwụ na ihe ndị ọzọ. Ma, Diuterọnọmi 18:10 kwuru na e kwesịghị ịhụ onye ọ bụla na-eme ụdị ihe ndị ahụ n’etiti anyị. Nke a pụtara na ihe ndị ahụ ekwesịghịkwa ịdị n’ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ.”​​—Brandon.

Rose

“Ọ bụrụ na ihe a na-egosi na tiivi ma ọ bụ fim ị na-ele na-ekwu gbasara ime mgbaasị, gbalịa kwụsị ile ya, ọ bụrụgodị na ọ pụtara ịgwa ndị enyi gị na ahụ́ erughịzi gị ala ịna-ele ya. Mmadụ inwe akọnuche dị ọcha bara uru karịa ihe ọ bụla a na-egosi na tiivi ma ọ bụ fim.”​​—Rose.

a Nke a apụtaghị na akụkọ ifo niile nwere ihe jikọrọ ha na ime mgbaasị. Ma, Ndị Kraịst na-eji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ ezere ime ihe ọ bụla ma ọ bụ ntụrụndụ ọ bụla nwere ihe jikọrọ ha na mgbaasị.​—2 Ndị Kọrịnt 6:17; Ndị Hibru 5:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya