19 Onye nchụàjà ga-ewere otu ubu ebule ahụ e siri esi,+ si n’ime nkata ahụ were otu achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri na otu achịcha na-ekoghị eko dị fere fere. Ọ ga-achịkwasị ha n’ọbụ aka abụọ onye Naziraịt ahụ mgbe ọ kpụcharala isi na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt.