5 dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ya na mmadụ ibe ya abanye n’ọhịa ịkpata nkụ, ya ewelie aka ya ka o jiri anyụike gbutuo osisi, ma isi anyụike ahụ efepụ n’osisi ya kụgbuo mmadụ ibe ya, onye ahụ gburu ya kwesịrị ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị a ka o wee dịrị ndụ.+