9 Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ihe niile unu na-arụ na-agara unu nke ọma nke ọma,+ mee ka ụmụ unu na anụ ụlọ unu na ihe ala unu na-emepụta dị ọtụtụ, n’ihi na ọ ga-amasị Jehova ọzọ ime ka ihe na-agaziri unu, otú ọ masịrị ya ime ka ihe gaziere nna nna unu hà.+