2 Sọl họpụtara puku ụmụ nwoke atọ (3,000) n’Izrel, ya na puku abụọ (2,000) n’ime ha anọrọ na Mikmash nakwa n’ala Betel bụ́ ugwu ugwu, Jonatan na otu puku (1,000) anọrọ+ na Gibia+ dị n’ebo Benjamin. Sọl wee gwa ndị Izrel fọrọnụ ka onye ọ bụla n’ime ha lawa n’ụlọikwuu ya.