6 Jonatan wee gwa onye na-eburu ya ngwá agha, sị: “Bịa ka anyị gafee ma gaa nso ebe ndị ahụ a na-ebighị úgwù nọ na-eche nche.+ Jehova nwere ike inyere anyị aka, n’ihi na Jehova chọọ ka anyị merie, o nweghị ihe ga-egbochi ya ime ya, ma ànyị hiri nne ma anyị ehighị nne.”+