3 Ma Devid gwara ya, sị: “Nna gị ma na ihe m dị gị mma.+ O nwekwara ike ịbụ na o kwuola n’obi ya, sị, ‘M gaghị ekwe ka Jonatan mata ihe a ka ọ ghara iwute ya.’ N’eziokwu, otú ahụ o doro anya na Jehova, bụ́ Chineke, dị ndụ nakwa na gịnwa dị ndụ, ka o doro anya na ọ gaghị ete aka ugbu a nke m agaa.”+