19 Biko, onyenwe m eze, gee ohu gị ntị: Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova mere ka ị na-emegide m, ya nabata àjà ọka m ga-achụrụ ya. Ma ọ bụrụ ndị mmadụ,+ ka Jehova taa ha ahụhụ, n’ihi na ha achụpụla m taa. Ha ekweghị ka m soro ndị Jehova nọrọ.+ Ha na-asịkwa m, ‘Gaa fewe chi ọzọ.’