4 Ma, ndị isi ndị Filistia wesara ya iwe ma sị ya: “Gwa nwoke a ka ọ laghachi.+ Ya laghachi ebe i nyere ya. Ekwela ka o soro anyị jee agha, ka ọ ghara ịgbanwe obi ya lụsowezie anyị agha n’agha ahụ.+ È nwere otú ọzọ ka mma ya na onyenwe ya ga-esi kpezie ma e wezụga i bugara ya isi ndị agha anyị?