4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ngwá agha: “Mịrị mma agha gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa mesie m ike ma were mma agha ha magbuo m.” Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ngwá agha ime ihe a ọ gwara ya, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ya. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+