20 Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ezinụlọ ya, Maịkal, nwa Sọl,+ bịara zute ya. Ọ gwakwara Devid, sị: “Eze Izrel emeela onwe ya ka ọ dị ebube taa mgbe ọ nọ n’ihu ndị ohu nwaanyị nke ndị na-ejere ya ozi gbara ọtọ na-agba egwú, otú onye nzuzu si agba onwe ya ọtọ n’ihu ọha.”+