2 Eze wee jụọ Zaịba, sị: “Gịnị mere i ji weta ihe ndị a?” Zaịba asị ya: “M kpụtara jakị ndị a ka eze na ezinụlọ ya na-agba ha. Ọ bụkwa ndị gị na ha so ka m wetaara achịcha ndị a na mkpụrụ osisi ndị a. Mmanya a bụkwa nke unu ga-aṅụ ma ike gwụ unu n’ala ịkpa.”+