5 “Ị makwa nke ọma ihe Joab nwa Zeruya mere m, ya bụ, ihe o mere Abna+ nwa Nee na Amesa+ nwa Jita, mmadụ abụọ bụ́ ndị isi ndị agha Izrel. O gburu ha+ n’oge udo dị, dị ka à ga-asị na a na-alụ agha. O tekwara ọbara agha n’ájị̀ o kere gburugburu úkwù ya nakwa n’akpụkpọ ụkwụ o yi n’ụkwụ.