26 Solomọn nọkwa na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya. O nwere otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ (1,400) nakwa puku ịnyịnya iri na abụọ (12,000).+ O dowekwara ha n’obodo dị iche iche a na-edowe ụgbọ ịnyịnya nakwa n’ebe dị yanwa bụ́ eze nso na Jeruselem.+