21 N’oge ahụ, Rehoboam nwa Solomọn malitere ịchị na Juda. Rehoboam dị afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jeruselem, bụ́ obodo Jehova họọrọ+ n’ime ebo niile n’Izrel ka a nọrọ na-eto aha ya.+ Aha nne Rehoboam bụ Neama. Ọ bụ nwaanyị Amọn.+