34 Ben-hedad asị ya: “M ga-enyeghachi gị obodo niile nna m naara nna gị. Ị chọọ, gị agaa na Damaskọs rụọ ebe ndị unu ga na-ere ahịa, otú nna m rụrụ na Sameria.”
Ehab asị ya: “Ọ bụ maka ihe a mụ na gị kwekọrịtara ka m ga-eji ahapụ gị ka ị lawa.”
Ha abụọ gbaziri ndụ, Ehab ahapụ ya ka ọ lawa.