29 “‘Lekwa ihe ị ga-eji ama na ihe ndị a ga-emerịrị: N’afọ a, unu ga-eri ọka wit ndị puuru onwe ha. N’afọ nke abụọ, unu ga-erikwa ọka wit ndị puuru onwe ha.+ Ma n’afọ nke atọ, unu ga-akụ ọka wit, ghọrọkwa mkpụrụ ya, kọọ ubi vaịn, riekwa ihe si na ya.+