13 Gaanụ jụọ Jehova ase n’aha m, n’aha ndị ala anyị, nakwa n’aha ndị Juda niile. Jụọnụ ya gbasara ihe e kwuru n’akwụkwọ a a hụrụ, n’ihi na Jehova ga-ewesa anyị ezigbo iwe+ maka na nna nna anyị hà emeghị ihe o kwuru. Ha emeghị ihe niile e dere n’akwụkwọ a ka anyị mee.”