14 Hilkaya onye nchụàjà na Ahaịkam na Akbọ na Shefan na Asaya wee gakwuru Họlda onye amụma nwaanyị.+ Họlda bụ nwunye Shalọm nwa Tikva nwa Hahas, onye na-elekọta uwe. N’oge ahụ, Họlda bi n’ebe a na-akpọ Obodo Ọhụrụ na Jeruselem. Ha gara ebe ahụ gwa ya ihe mere ha ji bịa.+