23 Ozugbo ndị niile bụ́ ndị isi ndị agha na ndị agha ha nụrụ na eze Babịlọn họpụtara Gedalaya, ha bịakwutere Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa. Ndị isi ndị agha ahụ bụ: Ishmel nwa Netanaya, Johenan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet onye Netofa, na Jeazanaya nwa onye Meakat, ha na ndị agha ha.+