2 Ma, Jehoshiba nwa Eze Jehoram, nwanne Ehazaya, zooro ezoro si ebe ụmụ eze ndị nwoke a chọrọ igbu nọ kupụ Jehoash+ nwa Ehazaya. O kunyere ya nwaanyị na-enye ya ara ma kpọba ha abụọ n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime. Ha zoro ya ka Atalaya ghara ịhụ ya, nke mere na e gbughị ya.