49 Erọn na ụmụ ya+ na-esu àjà ọkụ n’elu ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ,+ na-achụkwa insens n’àjà n’elu ebe ịchụàjà insens.+ Ha na-arụkwa ọrụ niile ha kwesịrị ịrụ gbasara ihe ndị kacha nsọ. Ha na-arụ ya iji na-ekpuchiri ndị Izrel mmehie ha+ otú Mosis ohu Chineke kwuru ka a na-eme.