19 Ọ sịkwara: “Tụfịakwa! Agaghị m aṅụ mmiri a n’ihi na m na-atụ egwu Chineke m. Olee ihe mere m ga-eji ṅụọ ọbara ụmụ nwoke a gaara anwụ+ ebe ha gara iseta mmiri? Ha gaara anwụ n’ihi ihe a ha mere.” N’ihi ya, o kweghị aṅụ ya. Ihe a ka ndị dike atọ ahụ so ná ndị agha ya mere.