17 Devid pụtakwara ịhụ ha ma sị ha: “Ọ bụrụ na unu bu ihe ọma n’obi bịa ka unu nyere m aka, obi mụ na unu ga-abụ otu. Ma, ọ bụrụ na unu bịara ka unu rara m nye n’aka ndị iro m n’agbanyeghị na aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hà hụ ya ma kpee ikpe mụ na unu.”+