4 Devid jidekwara otu puku (1,000) ụgbọ ịnyịnya Hadadiza, na puku ndị agha ya asaa (7,000) na-agba ịnyịnya nakwa puku ndị agha ya iri abụọ (20,000) ji ụkwụ aga.+ O sekwara ịnyịnya niile na-adọkpụ ụgbọala ha akwara ma e wezụga otu narị (100) n’ime ha ọ hapụrụ.+