15 Ezi Chineke zigakwara otu mmụọ ozi ka o gbuchapụ ndị bi na Jeruselem. Ma, ozugbo Jehova hụrụ na mmụọ ozi ahụ ebidola igbu ha, o meteere ndị ya ebere.+ Ọ gwaziri mmụọ ozi ahụ chọrọ igbuchapụ ha, sị: “O zuola!+ Wetuo aka gị.” Mmụọ ozi Jehova nọ nso n’ebe Ọnan+ onye Jebus+ na-azọcha ọka.