13 Eze Rehoboam nọ na-achị, na-emekwa ka ọchịchị ya sie ike na Jeruselem. Rehoboam dị afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jeruselem, bụ́ obodo Jehova họọrọ n’ime ebo niile n’Izrel ka a nọrọ na-eto aha ya. Aha nne Rehoboam bụ Neama. Ọ bụ nwaanyị Amọn.+