25 Mgbe ha hapụrụ ya lawa (n’ihi na ha merụrụ ya ezigbote ahụ́ hapụ ya), ndị na-ejere ya ozi gbaara ya izu maka na o gburu ụmụ Jehoyada+ onye nchụàjà. Ha gburu ya ka o dina n’àkwà ya.+ Ha likwara ya n’Obodo Devid,+ ma ha elighị ya ebe a na-eli ndị eze.+