5 Ọ lụsoro eze ndị Amọn agha,+ meriekwa ya na ndị ya. Ọ bụ ya mere ndị Amọn ji nye ya otu narị (100) talent ọlaọcha n’afọ ahụ, nyekwa ya ọka wit dị puku kọọ iri (10,000), na ọka bali dị puku kọọ iri (10,000). Ndị Amọn jikwa ihe ndị a kwụọ ya ụgwọ n’afọ nke abụọ na nke atọ.+