9 Ha gakwuuru Hilkaya bụ́ nnukwu onye nchụàjà, nye ya ego e wetara n’ụlọ Chineke. Ọ bụ ndị Livaị ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ahụ nche natara ego ahụ. Ha natara ya ndị ebo Manase, Ifrem, na ndị Izrel ndị ọzọ+ nakwa ndị ebo Juda, Benjamin, na ndị bi na Jeruselem.