11 Ha wee malite ịbụ abụ iji too Jehova ma kelee ya. Otu ìgwè na-abụ abụ, ìgwè nke ọzọ ana-ekwe ekwe,+ sị, “n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya o nwere n’ebe Izrel nọ na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ndị Izrel niile wee jiri oké olu too Jehova maka na a tọọla ntọala ụlọ Jehova.