13 M fechakwara uwe m wee sị: “Ka ezi Chineke si otú a fechapụ onye ọ bụla na-emezughị nkwa a n’ụlọ ya nakwa n’ihe o nwere. Ka e sikwa otú a fechapụ ya ma mee ka ọ gbara aka.” Ọgbakọ ahụ niile wee sị: “Amen!” Ha wee too Jehova, mmadụ niile mezukwara nkwa ha kwere.