28 “Ma ozugbo ha nweere onwe ha, ha na-ebidokwa mewe ihe na-adịghị gị mma.+ Ị na-ahapụ ha ka ndị iro ha kpara ha aka, ha na-emegbukwa ha.+ Ha na-alọghachi kpọkuo gị ka i nyere ha aka.+ Ị na-anọ n’eluigwe nụ ma napụta ha ugboro ugboro n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+