29 N’agbanyeghị na ị na-adọ ha aka ná ntị ka i wee mee ka ha bidokwa idebe Iwu gị, ha buliri onwe ha elu ma jụ ige ntị n’iwu gị.+ Ha mebikwara ntụziaka i nyere ha, bụ́ nke na-eme ka onye na-edebe ya dị ndụ.+ Ma, ha nọ na-eme isi ike ma na-agba isi akwara, ha ekweghịkwa ege ntị.