15 N’ụbọchị ndị ahụ, m hụrụ ndị bi na Juda ka ha na-azọchapụta mmanya n’Ụbọchị Izu Ike.+ Ha na-ebubata ikpo ọka, na-ebukwasị ha n’elu jakị, na-ebutekwa mmanya, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, na ụdị ibu ọ bụla na Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike.+ M wee dọọ ha aka ná ntị ka ha kwụsị ire ihe n’ụbọchị ahụ.