9 Nwa agbọghọ ahụ dị Hegaị mma. Ihe ya masịkwara ya. N’ihi ya, o mere ngwa ngwa hazie ka e nye ya ihe ọ ga-eji na-achọ mma+ na ihe ọ ga na-eri. O sikwa n’ụlọ eze họta ụmụ agbọghọ asaa ga na-ejere ya ozi. Ọ kpọfekwara ya na ụmụ agbọghọ ya ebe kacha mma n’ụlọ ụmụ nwaanyị.