14 Ná mgbede, ọ ga-agakwuru eze. N’ụtụtụ, ọ ga-aga n’ụlọ ụmụ nwaanyị nke abụọ nke onye na-elekọta ya bụ Sheashgaz, bụ́ ọnaozi eze,+ onye na-elekọta ndị iko ya. Nwa agbọghọ ahụ agaghị agakwuru eze ọzọ ọ gwụla ma ihe ya ọ̀ dị eze mma, ya akpọọkwa ya aha ka ọ bịa.+