2 Ònye nyere onye si ebe ọwụwa anyanwụ ike?+
Ònye kpọrọ ya ka ọ bịa kpee ikpe ziri ezi,
Ka e nyefee mba dị iche iche n’aka ya,
Meekwa ka o merie ndị eze dị iche iche?+
Ònye ji mma agha ya gbuo ha, ha aghọọ uzuzu?
Ònye jikwa ụta ya gbajasịa ha, ha adị ka ahịhịa ọka nke ifufe na-ebugharị?