16 Ihe a ga-eme ka onye ọ bụla nke chọrọ ka a gọzie ya n’ụwa
Rịọ Chineke, onye na-ekwu eziokwu, ka ọ gọzie ya.
Ọ ga-emekwa ka onye ọ bụla nke na-aṅụ iyi n’ụwa
Jiri Chineke, onye na-ekwu eziokwu, ṅụọ iyi.+
N’ihi na ha ga-echefu ahụhụ niile ha tara.
M gaghị eji anya m ahụ ahụhụ ndị ahụ ọzọ.+