30 Ugbu a e bibiri ihe niile i nwere, gịnị ka ị ga-eme?
Ị na-eyibu ákwà dị oké ọnụ.
Ị na-ejibu ihe e ji achọ mma e ji ọlaedo mee achọ onwe gị mma.
Ị na-etebu uri anya ka anya gị maa ezigbo mma.
Ma, ọ bụ n’efu ka ị nọ na-achọ onwe gị mma,+
N’ihi na ndị ọ na-agụ agụụ ka gị na ha kwaa iko ajụla gị.
Ha na-achọzi igbu gị.+