15 N’ihi ya, e nwere ihe Jehova kwuru gbasara ndị amụma ahụ na-ebu amụma n’aha ya, ndị ọ na-abụghị ya dunyere, ndị na-asị na a gaghị eji mma agha ebibi ndị obodo a nakwa na ụnwụ agaghị ada na ya. O kwuru, sị, ‘A ga-eji mma agha na ụnwụ laa ndị amụma ahụ n’iyi.+