3 Jehova sịrị: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume. Napụtanụ onye a na-emegbu emegbu n’aka onye na-emegbu ya. Unu emekpala onye mbịarambịa ọ bụla ahụ́. Unu emesikwala nwa na-enweghị nna na nwaanyị isi mkpe ike.+ Unu egbukwala onye aka ya dị ọcha.+