18 “Ọ bụ ihe a mere Jehova ji kwuo gbasara Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, sị,
‘Ha agaghị eruru ya uju, na-asị:
“Ewoo, ị dị ka nwanne m nwoke! Ewoo, ị dị ka nwanne m nwaanyị!”
Ha agaghịkwa eruru ya uju, sị:
“Ewoo, nna anyị ukwu! Ewoo, onye dị ebube!”