2 Jeremaya kwuziri, sị: “Jehova gwara m, sị, ‘Gaa guzoro n’ogige ụlọ Jehova kwuo ihe niile m ga-agwa gị ka i kwuo gbasara ndị niile bi n’obodo dị iche iche dị na Juda, ndị na-abịa n’ụlọ Jehova ife ya. Gwa ha ihe niile m na-aga ịgwa gị. Ya enwekwala nke ị ga-ahapụ ịgwa ha.