14 M ga-ekwe ka unu chọta m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. Jehova kwukwara, sị: ‘M ga-akpọkọta ndị obodo unu a dọọrọ n’agha. M ga-esikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+