58 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị:
“A ga-akwada mgbidi Babịlọn n’agbanyeghị na ọ dị igbidi.+
A ga-agbakwa ọnụ ụzọ ámá ya ọkụ n’agbanyeghị na ọ dị elu.
Ndị dị iche iche ga-arụgbu onwe ha n’ọrụ na nkịtị.
Ọkụ ga-agbakwa ihe mba dị iche iche ji maka ya rụgbuo onwe ha n’ọrụ.”+