20 A bịa n’ihe gbasara arịa niile Eze Solomọn rụrụ n’ụlọ Jehova, ma ogidi abụọ ma nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma oké ehi iri na abụọ+ dị n’okpuru ya, bụ́ ndị e ji ọla kọpa kpụọ, ma ihe ndị e ji ebu ihe, a gaghị atụli ọla kọpa o ji rụọ ha atụ̀, n’ihi na ha karịrị akarị.