2 Ụbọchị ole ị ga-anọchibido obodo a zuo, ị ga-anọ n’ime ya gbaa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ntutu gị ahụ ọkụ.+ Ị ga-achịrịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ, na-egbu ya mma agha gbaa obodo a gburugburu.+ Ị ga-aghasasịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ikpeazụ ka ikuku buru ya. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+